English Musa maka Igbo


Asụsụ Igbo bụ asụsụ mpaghara nke Naịja-Kongo nke ihe rúrú nde mmadụ iri anọ na abụọ na-asụ na Naịjirịa. Ọ bụ ọtọgrafi ndị Rom a kpọrọ Ọnwụ ka e ji ede ya, n'afọ 1961 e nwere nnọkọ n'etiti Ndị Ụka ọzọ nakwa ndị mgbasaozi ọma Roman Katọliiki. Mana ihe gbasara nsụpe abụghị ihe a kapịrị ọnụ. Abịdịị Ọnwụ nwere ihe ịma aka abụọ: o nweghị nkwado ndị odide, ndị mbipụta nakwa kọmputa dị icheiche; nakwa enweghị nkwado ụda dị n'olumba Igbo dị icheiche. Teknụzụ ọgbaraọhụrụ ga-eleba anya na nsogbu nke mbụ, mana nsogbu nke abụọ bụ ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọtọgrafi Ọnwụ bụ nke na-akwado nkwalite Igbo izugbe- bụ nke sitere n'olu Owere, olundi izugbe. Ụdaọnụ,Ụdaikuku na ụdaimi (nke a kọwara n'okpuru) bụ nke pụrụ iche n'Owere, ma gharakwa ịdị n'izugbe! Ikekwe ọ bụ ya mere onye Igbo a ma ama na-ede akwụkwọ ma nwee nturuugo Chinụa Achebe ekweghị ede na ya. N'ọtụtụ asụsụ, olundi izugbe bụ olundi jikọrọ asụsụ niile (Bekee, Frenchị) maọbụ akwụkwọ ederede nka (Jaman, Ịtalian); Asụsụ Yoruba si n'olundị Oyo. Mana Igbo izugbe ezughị Igbo ọnụ; kama a kpafanyere olundi dị icheiche na ya, dịka asụsụ Igbo pijin. Otu ihe Musa ga-eme nụ ime ka onye Igbo ọbụla dee n'asụsụ (olundi) ya n'ihu, ọ bụrụgodị na ọ ghọtaghị ihe ndị ọzọ na-asụ 100%. Ee, Musa ga-ede Igbo Izugbe.

Naịjirịa buru ibu ma bụrụ obodo sara mbada. O nwere ihe karịrị nde narị mmadụ abụọ, na ihe ruru ọ dịkarịa ala narị asụsụ ise, ma nabata ndịiche ndị a ihe ruru otu narị afọ. N'ihi ndị ọcha chịrịla ya, asụsụ Bekee bụ asụsụ bụ isi, ọ dị mfe na asụsụ Naijiria niile bụ nke e ji mkpụrụodide Bekee ede. Mana ọ naghị arụcha ọrụ nke ọma: ọtụtụ asụsụ Naịjirịa nwere ụdị icheiche nke mkpụrụodee Bekee enweghị ike ide ha.

Na 1928,otu ndị nchọcha wepụtara Mkpụrụedemede Afrịka nwere mkpụrụodee 36. Nke a ka e sochiri na 1978 site n'African Reference Alphabet nke nwere mkpụrụodee 60 (na nhazi nke ikpeazụ), nakwa afọ olenaole gáfèrè e nwee "Pan-Nigerian Alphabet" mkpụrụodee 33 maka naanị asụsụ Naịjirịa. Mana o nweghị mkpụrụedemede ndị a a na-akụpụta n'igwe maọbụ ha enwee fọntụ.

Ka "Unicode" si bata na senchuri a, e nwere mkpụrụedemede 1350 na mmụta mkpụrụodide Latin, bụ nke a kwadoro nke ọma. Ka o si dị, ụfọdụ asụsụ ndị Naịjirịa bụ nke mkpụrụ odide ezughị ezu, dịka ihe atụ ntụpọ dị n'ụdaume na akara ụdaolu.

Dịka ihe mpụta dị n'akụkọ ezighị ezi, nakwa mmasị ide na mkpụrụ odide ndị ọcha, ọtụtụ asụsụ Naịjirịa ndị ọzọ e nweela mkpụrụodide ha kwadoro: Tafi maka Awụsa,Ndẹ́bẹ́ maka Igbo, Oduduwa maka Yoruba, na Adlam maka Fula, dịka ihe atụ. Nsogbu bụ na a ga-ekewa Naịjirịa na mpaghara dị icheiche nke na o nweghị ndị ga-agụ nke ibe ha, n'ikpeazụ, kama ịkwado asụsụ Naịjirịa dị icheiche, onye ọbụla ga-ede na Bekee, ọ bụladị ịsụpe aha ndị mmadụ nakwa ebe, dịka o si dị ugbua n'India.

Musa bụ ebe okwu gwụrụ. Ọ ga-edenwu asụsụ Naịjirịa niile (na Bekee!) ya na mkpụrụ odide dabeere na naanị ụzọ 19, nakwa kibọọdụ 26. Na Musa, otu mkpụrụodide na ụda bụ otu, nke abụghị otu ihe ugbua, ka ọ ga-abụ onye na-asụ Awụsa nwere ike gụọ aha Igbo na-enweghị nsogbu ọbụla, ọ bụrụgodi na ọ maghị asụ Igbo. Ọ bụghị naanị na ọ naghị agụta ụda anyị chọrọ, mana ọ naghị egbochi gị ide ụda ọbụla dịka o si dị ugbua- ndị mmadụ dị ngana ma ghara itinye akara ụdaolu. Ebe Musa agaghị agwọta nsogbu niile nke asụsụ Naịjirịa, o sitekwaghị n'aka ndị ọcha n'oge gara aga.

Nsogbu niile a kpọtụrụ aha n'elu ebe a bụ nke a chịkọtara ọnụ n'otu mkpezi: Mkpụrụ Odide Rom niile enweghị mkpụrụedemde niile asụsụ Igbo nwere - nsogbu dịịrị ndị niile ji asụsụ dị icheiche eme ihe. Mana Musa nwere ya!

N'adịghị ka mkpụrụodee Rom, Musa nwere mkpụrụ édémédé niile a chọrọ n'Igbo. O nweghị uru ụdamkpị bara dịka ch gb gh kp ny kp ny maọbụ sh, o nweghị uru itinye ntụpọ dịka ị ọ ụ ṅ. Tinyekwara na Musa nwere mkpụrụodee niile e nwere iji dee olundị ọbụla dịka o si daa.

Musa mere ka ọ dị mfe ide ụdaolu, o nweghị uru ọ bara ịhapụ ha. Karịa ịbụ naanị asụsụ ụdaolu, Igbo bụ asụsụ ụdaume (nke dị iche n'asụsụ mgbochiume a kpọrọ Afroietiiki dịka Awụsa, Amhariki maọbụ Arabiiki). Igbo nwere ndakọrịta ụdaume n'etiti mkpụrụokwu - ụdaume i e o u anaghị abata n'otu ụdaume dịka ị a ọ ụ:

Dịka asụsụ ọgbaraọhụrụ ọbụla, Igbo nwere ọtụtụ okwu mbite, ebe a ga-eji Musa dee asụsụ ọbụla, a ga-eji Musa sụpee okwu mbite ndị a, ikekwe n'ụdị odide dị iche. Dịka ihe atụ, nke a bụ aha Naịjirịa e dere n'Igbo site n'iji odide Njoya na Bekee e ji odide Dushan dee:

 

Musa nwere uru ndị ọzọ dị icheiche ọ bara:

Ihe gbasara iji usoroodide eme ihe na-atụ n'anya, ma nwee ọtụtụ ọgbatauhie nke agbasaghị ọtọgrafi maọbụ tekụnụzụ: usoro ndọrọndọrọ ọchịchị, agụmakwụkwọ, nhazi nchịkọta akụkọ na agụmagụ nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọ bụ mgbanwe obodo ọbụla agaghị aghọta ozugbo.

Mana asụsụ dị icheiche na-agbanwe usoroodide ha: dịka 25 n'ime otu narị afọ gara aga, nakwa atọ n'ime afọ gara aga maọbụ ihe yiri ya (Kazakh, Mongolian, na Inuktut). Ụfọdụ mgbanwe ndị a bụ nke gaziri nke ọma, karịsịa ebe usoroodide ndị Chaịna maọbụ Arabik abjad bụ nke e ji mkpụrụodide Latin dochie (ịdọ aka na ntị ndị nabatara Ajami) dịka ndị Vietnam, ndị Tọki maọbụ ndị Male.

Nsibidi, Nwagu Aneke na Ndẹ́bẹ́

Tupu a malite dewe Igbo, ndị Igbo bụ ndị ji Nsibidi ede ihe, bụ nke ndị Ekoi wepụtara. Nsibidi bụ asụsụ ederede, mana ọ bụghị ederede asụsụ a na-asụ n'ọnụ - ọ bụ asụsụ nke onwe ya. Na-adịghi ka Musa bụ ụzọ e si ede Igbo a sụrụ n'ọnụ, ọ bụghị asụsụ dị iche.

N'afọ ndị 1960, otu nwoke onye Igbo a kpọrọ Nwagụ Aneke wepụtara usoro odide ihe maka olundị ya bụ Ụmụleri. Ọ gụnyere ihe osise 200, nke ọbụla gụnyere mgbochiume + ụdaume. A na-akpọ ya "Nwagụ Aneke syllabary", o nwere ọtụtụ ihe ịma aka dị iche iche, o nwechaghị eserese nwere naanị ụdaume (dịka ọ dị n'Igbo), o nweghị nkwado ụdaolu, o nweghị ngwakọrịta mkpụrụedemede si olundị ọzọ (dịka ụdaimi), nakwa ihe odide gbara mkpị.

Sịlabarị dị mma maka asụsụ Igbo nakwa ọtụtụ asụsụ ndị nke Naịja-Kongo, ọ dịkwa mfe ịmụ karịa mkpụrụedemede, ọ bụ ya mere Musa ji ede asụsụ ndị a dịka sịlabarị. Mana sịlabarị e tinyere ihe ọzọ dịka Musa pụtara na ị mụ otu mkpụrụedemede ga-eme ka ọ dị mfe ịmụ ọzọ, ebe otu o si abịakarị ga-eme ka ọ dị mfe imepụta kibọọdụ.

Ndẹ́bẹ́, usoroodide ọgbaraọhụrụ, bụ ụzọ e si ede Igbo a na-asụ asụ, nke Ndibidi kwadoro. Ọ dị mma...mana a pụghị iji ya mee ihe. Nke a bụ ụfọdụ nsogbu ya:

  1. Otu n'ime nsogbu Ọnwụ nwere bụ na ndị na-ede ihe na-adị umengwụ ma ghara inwe akara ntụpọ mana Ndẹ́bẹ́ na-eji dọọtụ eme ihe dịka akara.
  2. Ndẹ́bẹ́ adịghị ngwa odide. Ihe atụ, mkpụrụ okwu bụ Igbo bụ nke e ji akara 13 ede ma e jiri ya tụnyere mkpụrụedemde 8 nke Ọnwụ maọbụ Musa.

  3. Nsogbu ọzọ ọtọgrafi Ọnwụ nwere bụ na o nweghị nzipụta nka: kibọọdụ, fọntụ dị icheiche, dere gazie. Dịka ihe atụ, e nwere akara koodumyiri maka ẹ́ ya na ntụpọ okpuru nakwa akaraụda dị abụọ n'aha Ndẹ́bẹ́. (Ihe ị hụrụ ebe a bụ nke e si ụzọ ọzọ wepụta n'ụdị abụọ.)

    Ndẹ́bẹ́ kasị njọ! Ọ bụghị naanị na akara Ndẹ́bẹ́ adighị na koodumyiri, mana o dịghị anya ka a pụrụ isi jiri ya eme ihe. Ọ bụrụ na e nwere ike ide ya dịka sịlabọ zuru ezu, ha ga-adị ọtụtụ. Usoro a ga-achọ ọtụtụ nkwado n'ụdị kibọọdụ na fọntụ, nke ga-eme ka ha sikwuo ike ma ghara ịdị mfe.

    Ọ ga-aka mma ka e dee Ndẹ́bẹ́ nke ọbụla n'ụdị nke ya - ahụ, radikaalụ, ụdaume na ụdaolu. Nke a na-anabata ihe a kpọrọ Advanced Typography maọbụ karịa iji kụpụta ihe ndị a n'otu mkpụrụ. Ọ ga-ekwe omume... mana ọ dịghị mfe. Ụzọ a ga-anakwere kibọọdụ buru ibu: ahụ 6, radịkaalụ 7, ụdaume 9 na ụdaolu 3 tinyekwara nkwụrụonwe 1 na nke ọbụla, tinyekwara 20+ dijiiti na akaraedemede: na nchịkọta ihe dịka kii 50 maọbụrụ na ụdaume na ụdaolu abụrụ nke e kewara. Ọ bụrụ na mgbochiume na ụdaume eyirita onwe ha (ahụ+radịkaalụ+ụdaolu), anyị ga-enwezu kii 80. Musa nwere 26.

    Edemede tara akpụ bụ otu ihe a chọpụtara mgbe a na-ede ihe a - afọ iri na abụọ mgbe e wepụtachara Ndẹ́bẹ́ - e nweghị kibọọdụ maọbụ fọntụ dị n'ahịa e ji ede Ndẹ́bẹ́ (na kibọọdụ nzipụ Naịjirịa). Na ntụnyere, Musa nwere ọkara kibọọdụ iri na abụọ na fọntụ iri abụọ na anọ o ji ede ihe.

  4. Echiche gbasara idezigharị mgbochiume dị mma... ruo mgbe i chebaara ya echiche! Anyị na-ewepụta mgbochiume kemgbe site n’asụsụ Latin: dịka ihe atụ, mkpụrụruedemede j na-ada ụda dị iche na Bekee John, Jaman Johann, French Jean na Spanish Juan, ebe ha niile nwere otu nsipuru. Mgbochiume dịka m nwere otu ụda ebe niile ka mma.

    Ọ bụrụ na anyị ejiri mgbochiume mmụba, ndị odee ga-amata na, a bịa n'ide mkpụrụokwu, ma a na-akpọ okwu ahụ n'ụdị dị iche n'olundị ọbụla (nke ọbụla ọ bụ ha chọrọ ide ya na mgbochiume mmụba) maọbụ na olundị niile na-akpọkọta ya ọnụ (nke ha ga-ede ya na mgbochiume nkịtị). Ịsụ olundị gị abụghị ebe okwu biri - i kwesịrị ịsụ olundị niile!

    Nkenụụdị olundị dị icheiche n'asụsụ Igbo bụ ihe ịma aka, mana ọ bụghị ihe mgbochi ọbụla. NdịIgbo kwesịrị ide olundị ha - nwee mkpụrụedemede nkịtị - na gbalịa ịmụ ma ghọta olundị dị icheiche ibe ha n'odide dịka ha si mee n'ịsụ ya asụ, dịka anyị si na-eme na Bekee, Hindi, Spanish, Arabiiki, Chaịna maọbụ asụsụ ndị ọzọ nwere olundị dị icheiche. Ndị Yank na-asị bæth na truck, ebe ndị Briten na-asị bɑth na lorry, ọ dị mma. N'ikpeazụ, ọ na-eme ka asụsụ tọọ atọ.

  5. Mana a bịagodị na Ndẹ́bẹ́ o nwere olileanya maka olundị ndị Igbo dị icheiche, e nweghị ike iji ya dee Yoruba, Edo, Ịjọ, Efik, Bekee maọbụ ọtụtụ asụsụ Naịjirịa ndị ọzọ nakwa asụsụ mbaụwa. Ọ bụrụ na onye Igbo agaa Legọsụ, Abuja, Kano, maọbụ na mba ofesi ọzọ, ha agaghị ahụ kibọọdụ maọbụ fọntụ ha ga-eji ede Ndẹ́bẹ́. Olee otu ha ga-esi ede bekee n'ụlọ - na kibọọdụ ha.

Uru kachasị Ndẹ́bẹ́ nwere bụ na ọ bụ Igbo, o yie ya. E ji ya egosịpụta ihe gbasara Igbo, mana ọ bụghị ezigbo ọtọgrafi. Ekwetara m na nkatọ niile onye dere Ndẹ́bẹ́ katọrọ Ọnwụ nakwa echiche ndị ọzọ, mana Ndẹ́bẹ́ abụghị ezigbo ihe ga-edozi ya.

Mkpụrụedemede Musa abụghị Igbo, ọ bụghị nke ndị Bekee, ọ na-ede Igbo nke ọma karịa Ndẹ́bẹ́. N'ihi na o nwere ike dee asụsụ mbaụwa ndị ọzọ, a ga-aka jiri ya mee ihe, ọ ka mma. O nwere kibọọdụ na fọntụ nakwa ezigbo nkwado dijitaalụ zuru ezu. Ndị Igbo nwere ike ibido jiri ya eme ihe echi...ha kwesịrị!

Ide Igbo na Musa

Na mpaghara a, anyị ga-akụziri gị ka ị ga-esi ede Igbo na Musa - ọ dị mfe karịa ka i si chee.

Mkpụrụokwu edo edo esoghị n'ọtọgrafi Ọnwụ. E jighị ha ede Igbo izugbe, mana e ji ha ede olundị ndị ọzọ.

Ụdaume

Anyị ga-amalite n'ụdaume dị icheiche:

u o i e

a ə

nọchiri a na, dịka ihe atụ Item, Nsụka, Mbieri, na Abọ. Ə dị n'olundi Item, Ikwo, nakwa olundị ndị ọzọ. Ụfọdụ tụrụ aro na mkpụrụedemede maka schwa ə ka a ga-ekewa ka o nwee ike gosị ndakọrịta ụdaume1, mana nke ahụ abaghị uru n'ụda: ha na-adakọta ọnụ.

Ụdaume Ogologo

N'etiti mkpụrụokwu, e kewara ụdaume abụọ na Musa site na Nkewa , ebe a na-akpọpụta ụdaume abụọ ndị ahụ n'ụdị dị iche dịka sịlabụ. Mana bịambịaụdaume - na-apụtakarị n'olilo - bụ nke pụtakarịsịrị ihe, na-ebute ụdaume ogologo. Ọtọgrafi ọhụrụ a na-ede ụdaume ugboro abụọ mana Musa na-ede nke abụọ dịka akara ogologo . Ụda nke abụọ ka e ji ogologo akara ede. Ma Nkewa ma ogologo akara na-ekwere akarauhie, mana Nkewa na-adị ogologo dịka mgbochiume, ebe ogologo akara na-adị nkenke dịka ụdaume.


táà

Ụdaume imi

Ọtụtụ olundị nwere sịlabụs ụdaimi, bụ nke anyị chere na ọ bụ ụdaume (na nke anyị na-ekwu maka ụdaimi ). Ya dịkarịa ala n'ụfọdụ olundị dị icheiche, ụdaimi bụ fọnịm: ụdaume imi dị iche n'oyiyi mkpọnimi na ụdaume ọnụ. N'olundị ọtụtụ, mpụta ihe na ihe apụtaghị nke ụdaume imi bụ nke dị n'usoro fọnọlọji, nke ga-eme ka ụdaimi nke dị ka alofoniiki. Dịka ihe atụ, ụdaume nwere mgbochiimi abụọ na mkpọnimi ebe ụdaume dị gburugburu friketiivu nwere ike nwee ụdaimi maọbụ na o nweghị, na ụdaimi dị na ụdaike. Ụfọdụ nkọwa na-eso na ụdaimi ruo na mgbochiume iji kọwaa ka o si gosị ụdaimi na nke enweghị ụdaimi nke nwere oyiyi friketiivu.

Mana Musa nwere fonetiiki, anyị achọghị ịma ma ụdaimi o nwere mkpụrụụdasụsụ maọbụ o nwere usoro! Anyị chọrọ ka Musa na-ede ụda olundị ọbụla ka a ga-asị na a na-edere ndị anaghị asụ ya. Anyị na-ede ụdaimi site n'itinye ọkara mgbakwunye nsonaazụ na mkpụrụedemede ụdaọnụ, ebe e nwere ike mata usoro mkpụrụụdasụsụ nakwa ebe ụdaọnụ pụtara ihe.

Anyị na-eji otu akara iji sụpee myiriụdaume, mana a bịa nke a, o soghị n'ụdaume: ọ na-esochi mgbochiume na-egosị mkpọpụta. Ka o si dị, mkpụrụokwu bụ nta na-asụpe myiriụdaume dịka n ma nweekwa nsonaazụ mkọnimi, ebe o loro t, dịka e si sụpee ya na ñta.

 
ọ́mā ńtà

Ụdaolu

Igbo nwere ụdaolu ọ dịkarịa ala atọ: ụdaelu, ụdaala na ụdansụda. Musa na-ede ha site n'iwelite ogo ụdaume: ụdaume nwere ụdaelu na-adị elu, mana ụdaume nwere ụdaala dị ala. Ụdaume nwere ụdansụda, nke na-eso naanị ụdaelu, bụ nke a na-ede dịka ụdaelu ma nwee akara n'okpuru. Ụfọdụ olundị nwere ụdaelu na ụdaala. Ihe atụ dị ebe a:

   
ísí ísì ìsì ísī î ǐ

N’ịgbakwunye ụdaolu, Igbo na-eji ogoolu iji zipụta nghọta nakwa ọdịdị ihe. Dịka asụṣụ ndị ọzọ, ogoolu bụ nke a na-ede na Musa site n’iji akaraedemede. Lee anya na peeji kọwara ogoolu maka nkọwa.

Mgbochiume

Asụsụ Igbo nwere mmasị n'ụzọ dị icheiche o si akọwa mgbpchiume, ọ bụ ezie na ụzọ ndị a apụtaghị ihe n'olundị ọbụla:

Eserese dị n'okpuru na-egosị mgbochiume Igbo Izugbe niile tinyere ọtụtụ mgbochiume ndị ọzọ si olundị dị icheiche. Ọ na-egosịkwa mgbakwunye Musa ji ezi mkpọnimi, ụdaakpo nakwa ụda egbugbereọnụ. Mgbochi ikuku bụ nke e gosịrị n'ihe na-acha anụnụ anụnụ - Musa anaghị agbakwunye nsonaazụ ma a na-ede ha. Mana eserese a abụghị ebe okwu biri: e nwere ọtụtụ mgbochiume ndị ọzọ site n'olundị dị icheiche, ikekwe pf, ð, maọbụ mbịakọta egbugbereọnụ abụọ. N'ọtụtụ ebe, Musa nwere mkpụrụedemede maka ha.


m n ny nw ˜


b gb d dz j g gw

ụdaikume

 
p kp t ts ch k kw q

ụdaikuku

vb v z ż gh h

ph f s sh sw


l r y -y w -w nkewa

Notes:

Ngwaele

Ugbua ị maara mkpụrụedemede, ọ gaghị adị mma ka ị gbalịa gụọ ụfọdụ Igbo e dere na Musa?


Ìgbò na-asụ n'olu n'olu, a kwaa ụkwara ọ bụrụ otu

Edemede Abụọ

Iji zoo aka ka Igbo si dị ma e jiri Musa dee ya, ebe a bụ edemede abụọ: mpagharaokwu mbụ nke Igbo n'ihe odide Wikipedia bụ Asụ̀sụ̀ Ìgbò, bụ Musa na ọtọgrafi ndị Rom maka ntulerịkọta. Aha dị icheiche si mbaọzọ bụ nke e dere na fọntụ Dushan; Igbo dị na fọntụ Njoya.



Asụsụ Igbo bụ asụsụ Niger-Congo nke mmadụ ruru ndè iri abụọ na ise nke ndị juru na ya bụ ndị Igbo. Na ndida-owuwa anyanwụ Naijiria na ebe Niger Delta, Igbo bụ díàlà. Ha dèrè ya na édé Latin, nke ndí mpaghara Britain nwètèrè. Nkárị ndị ọzọ bụ nké Èkpè búrú nkárị Nsịbịdị. Asụsụ Igbo bụ ólú nke a na-akpọ n'ezigbo hanwa. Ọ dị ike taa ndi ọbịá ịsụta ya, dịkwa ike taa ndi Igbo ọzọ bi na ámá nkẹ ọzọ ịmátá ihe ndi nke ọzọ na-ekwu, maka na ndi Igbo na olu Igbo hiri nne. E nwere mkpụrụ edemede Igbo dị 36, ụdaume asatọ na mgbochiume ọgụ na asato.


© 2002-2024 The Musa Academy musa@musa.bet 06apr24